10“Ekwujọla ohu nʼihu nna ya ukwu, ka ọ ghara ịbụ gị ọnụ, ikpe amaa gị.
11“Ọ dị ndị na-akọcha nna ha, ha adịghị agọzikwa nne ha;
12Ọgbọ ndị dị ọcha nʼanya nke onwe ha ma asapụbeghị isisi nʼunyi ha ruru.
13Ọ dị ndị anya ha dị nʼelu, ndị ile anya ha jupụtara na nlelị.
14Ndị eze ha niile bụ mma agha ịkịrị eze ha bụkwa mma maka irichapụ ndị ogbenye site nʼụwa na ndị nọ nʼụkọ site nʼetiti mmadụ.