12Ọgbọ ndị dị ọcha nʼanya nke onwe ha ma asapụbeghị isisi nʼunyi ha ruru.
13Ọ dị ndị anya ha dị nʼelu, ndị ile anya ha jupụtara na nlelị.
14Ndị eze ha niile bụ mma agha ịkịrị eze ha bụkwa mma maka irichapụ ndị ogbenye site nʼụwa na ndị nọ nʼụkọ site nʼetiti mmadụ.
15“Etu nwere ụmụ nwanyị abụọ ndị na-eti, ‘Nye, nye.’ “Ọ dị ụzọ ihe atọ nke afọ na-adịghị eju. E, anọ dị na-adịghị asị, ‘O zuola.’
16Ala ili, akpanwa nwanyị na-adịghị atụ ime, ala nke mmiri na-adịghị eju afọ, na ọkụ nke na-adịghị asị, ‘O zuola.’