19Nʼọbụaka ya ka o jidere osisi ịtụ ogho akwa; mkpịsịaka ya na-ejidesikwa ozele e ji na-ekwe akwa ike.
20Ọ na-agbasapụ aka inyere ndị ogbenye na ndị mkpa na-akpa aka.
21Udu mmiri maọbụ oge oke oyi adịghị eche ya uche nʼihi na ndị niile nọ nʼezinaụlọ ya nwere uwe ha ga-eji chụọ oyi.
22Ọ na-akpa akwa a na-agbasa nʼelu ihe ndina, ma ya onwe ya na-eyikwa uwe e ji ezi akwa ọcha na akwa odo odo dụọ.
23Di ya bụ onye a na-asọpụrụ nʼọnụ ụzọ ama obodo ebe ọ na-ewere ọnọdụ nʼetiti ndị okenye nke ala ahụ.