17Ike ịrụ ọrụ adịghị agwụ ya. Ọ dị nnọọ ike, bụrụkwa onye na-arụpụta ihe dị iche iche.
18Ọ na-elezi anya hụ na ihe ahịa o mepụtara dị ezi oke ọnụahịa; ọ bụ nke a mere o ji na-arụ ọrụ ruo nʼime ime abalị.
19Nʼọbụaka ya ka o jidere osisi ịtụ ogho akwa; mkpịsịaka ya na-ejidesikwa ozele e ji na-ekwe akwa ike.
20Ọ na-agbasapụ aka inyere ndị ogbenye na ndị mkpa na-akpa aka.
21Udu mmiri maọbụ oge oke oyi adịghị eche ya uche nʼihi na ndị niile nọ nʼezinaụlọ ya nwere uwe ha ga-eji chụọ oyi.