Ilu 31

Ịma mma nke elu ahụ adịghị egosi ihe mmadụ bụ, nʼihi na ịma mma adịghị adịgide ogologo oge. Ma nwanyị ọbụla nke na-atụ egwu Onyenwe anyị bụ onye e kwesiri ito.

Proverbs 31:30 (UKJV) Favour is deceitful, and beauty is vain: but a woman that fears the LORD, she shall be praised.

28Ụmụ ya na-ebili gọzie ya; otu a kwa di ya ga-eto ya ezi otuto.

29Ọ ga-asị; “E nwere ọtụtụ ndị inyom ndị bụ ezi nwunye nye di ha, ma gị onwe gị kachasị ha niile mma.”

30Ịma mma nke elu ahụ adịghị egosi ihe mmadụ bụ, nʼihi na ịma mma adịghị adịgide ogologo oge. Ma nwanyị ọbụla nke na-atụ egwu Onyenwe anyị bụ onye e kwesiri ito.

31E kwesiri ito ya nʼihi ọrụ ọma niile nke aka ya rụpụtara. Ka ọrụ ya niile wetara ya otuto nʼọnụ ụzọ ama nke obodo.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.