2Gee ntị, nwa m, gee ntị, nwa nke afọ m. Gee ntị, nwa m, nwa nke ọziza ekpere m niile.
3Enyela ụmụ nwanyị ike gị, enyekwela ịdị ike gị nʼaka ndị nʼala ndị eze nʼiyi.
4Lemuel nwa m, ọ bụghị ihe kwesiri ekwesi na ndị eze ga-aṅụ mmanya. O kwesikwaghị ka agụụ ịṅụ mmanya bụrụ ihe ga na-agụ ndị eze.
5Ka ha ghara ịṅụbiga mmanya oke si otu a chefuo ikpe ikpe ziri ezi dịka iwu kwuru. Ka ha gharakwa isite nʼịṅụbiga mmanya oke napụ ndị a na-emegbu emegbu ikpe ziri ezi ha kwesiri inweta.
6Ndị e kwesiri inye mmanya bụ ndị ahụ na-ala nʼiyi, ndị ahụ nọ nʼọnọdụ oke ihe mgbu nke obi.