7Ka ha ṅụọ chefuo ọnọdụ ọjọọ ha, ka ha gharakwa icheta ọnọdụ nhụju anya ha.
8Jisie ike kwuchite ọnụ ndị ahụ na-enweghị ike ikwuru ọnụ onwe ha; kwuchitekwa ọnụ ndị niile ọnọdụ ha dị ala.
9Kwusie okwu ike, kpeekwa ikpe ziri ezi. Gbooro ndị ogbenye na ndị mkpa na-akpa ọgụ site nʼaka ndị na-emegbu ha.
10Nwanyị nwere ugwu onye ga-achọtali ya? Ọ dị oke ọnụ karịa nkume rubi.
11Di nwanyị dị otu a na-atụkwasị obi ya niile nʼime ya, ọ dịghị ihe dị mkpa nke na-akọ ya.