Ilu 4

ọ ziri m ihe, sịkwa m, “Ka obi gị jidesie okwu m niile ike, debe nʼiwu niile, ị ga-adịkwa ndụ.

Proverbs 4:4 (UKJV) He taught me also, and said unto me, Let yours heart retain my words: keep my commandments, and live.

2Ṅaanụ ntị, nwee uche, nʼihi na ọ bụ ezi ozizi ka m na-ezi unu; ya mere, unu ahapụkwala iwu m.

3Mgbe m bụ nwantakịrị nʼụlọ nna m, mgbe m ka dị ntakịrị, bụrụkwa naanị otu nwa nne m ji,

4ọ ziri m ihe, sịkwa m, “Ka obi gị jidesie okwu m niile ike, debe nʼiwu niile, ị ga-adịkwa ndụ.

5Nweta amamihe, nwetakwa nghọta, echezọkwala okwu m, maọbụ site na ya wezuga onwe gị.

6Ahapụla amamihe, ọ ga-echebe gị, hụ ya nʼanya, nʼihi na ọ ga-eduzi gị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.