3Mgbe m bụ nwantakịrị nʼụlọ nna m, mgbe m ka dị ntakịrị, bụrụkwa naanị otu nwa nne m ji,
4ọ ziri m ihe, sịkwa m, “Ka obi gị jidesie okwu m niile ike, debe nʼiwu niile, ị ga-adịkwa ndụ.
5Nweta amamihe, nwetakwa nghọta, echezọkwala okwu m, maọbụ site na ya wezuga onwe gị.
6Ahapụla amamihe, ọ ga-echebe gị, hụ ya nʼanya, nʼihi na ọ ga-eduzi gị.
7Mmalite amamihe bụ nke a, nweta amamihe, ihe ọbụla o ga-efu gị, nweta nghọta.