17Anya dị nganga, ire na-ekwu okwu ụgha, aka na-awụfu ọbara ndị na-emeghị ihe ọjọọ.
18Obi na-echepụta nzube ọjọọ; ụkwụ na-eme ngwangwa ịgbaba nʼajọ ihe,
19onyeama ụgha na-awụpụ ụgha dịka mmiri na onye na-agbasa esemokwu nʼetiti ụmụnna.
20Nwa m, debe ihe nna gị nyere gị nʼiwu, ahapụkwala iwu nke nne gị.
21Ka ndụmọdụ ha dịrị gị nʼobi mgbe niile, ka ị ghara ichefu ha.