15Nʼihi ya, mbibi ga-abịakwasị ya na mberede; nʼotu ntabi anya ka a ga-ebibi ya, apụghịkwa ịgwọta ya.
16Ọ dị ụzọ ihe isii Onyenwe anyị kpọrọ asị, e, ha dị asaa bụ ihe arụ nʼebe ọ nọ.
17Anya dị nganga, ire na-ekwu okwu ụgha, aka na-awụfu ọbara ndị na-emeghị ihe ọjọọ.
18Obi na-echepụta nzube ọjọọ; ụkwụ na-eme ngwangwa ịgbaba nʼajọ ihe,
19onyeama ụgha na-awụpụ ụgha dịka mmiri na onye na-agbasa esemokwu nʼetiti ụmụnna.