33A ga-eti ya ezi ihe otiti, a ga-elelikwa ya anya, ihere ya agaghị ekwe ihichapụ.
34Nʼihi na di nwanyị ahụ ga-esite nʼekworo wee iwe dị ọkụ; ọ gakwaghị enwe obi ebere nʼebe ọ nọ nʼụbọchị ọ ga-abọ ọbọ.
35Ọ gaghị anara ihe ọbụla nʼọnọdụ ihe nkwụghachi nʼihi ihe ọjọọ o mere ya. O nwekwaghị ihe a ga-enye ya pụrụ ime ka iwe ya dajụọ.