22O sooro nwanyị ahụ dịka ehi a na-adọkpụ na-aga ebe a ga-egbu ya, dịka ele nke na-aba nʼọnya,
23nke na-eche ka e were àkụ gbata ya nʼobi. Nwoke ahụ dịka nnụnụ nke na-efeba nʼọnya na-amaghị ihe na-eche ya pụrụ iwepụ ndu ya.
24Geenụ ntị, ụmụ m, ma ọ bụghị naanị ige ntị, kama meekwanụ ihe m na-ekwu.
25Ekwela ka agụụ nke obi gị chịa gị; ejela nwanyị dị otu a nso; gbaara ya ọsọ, ka ọ ghara ịnwa gị nwetakwa gị.
26Nʼihi na o mebiela ndụ ọtụtụ mmadụ, ọtụtụ mmadụ amaala nʼọnya ya.