16Site na m ka ndị eze ji achị bụ ndịisi niile na-achị nʼụwa.
17Ndị niile hụrụ m nʼanya ka m na-ahụ nʼanya. Ndị niile na-achọ m aghakwaghị ịchọta m.
18Ana m ekenye ụba na nsọpụrụ, na ikpe ziri ezi na ezi omume.
19Onyinye m na-enye dị mma karịa ọlaọcha, ọ karịkwara ọlaedo.
20Ana m aga ije nʼụzọ ezi omume, nʼokporoụzọ ikpe ziri ezi.