20Ana m aga ije nʼụzọ ezi omume, nʼokporoụzọ ikpe ziri ezi.
21Ndị niile hụrụ m nʼanya, na-eketa akụnụba. Ana m emejupụtakwa ụlọakụ ha.
22“Onyenwe anyị kpụrụ m dịka mmalite ụzọ ya, tupu o bido ike ihe ọbụla ọzọ.
23Site nʼebighị ebi gara aga ka m dị; adịkwa m adị tupu e kee ụwa.
24Anọ m na-adị tupu e kee ogbu mmiri, tupu isi iyi ọbụla agbapụta mmiri nʼelu ụwa,