1Onyenwe anyị, gịnị mere i ji na-eguzoro onwe gị nʼebe dị anya? Gịnị mere ị na-ezo onwe gị nʼoge nsogbu?
2Site na mpako, onye ajọ omume na-emegbu ndị na-adịghị ike, ndị mpịa mpịa aghụghọ ya mara dịka ọnya.
3Ọ na-anya isi banyere ọchịchọ niile nke obi ya, ọ na-elelị Onyenwe anyị anya ma na-agọzi ndị oke ọchịchọ.