2Site na mpako, onye ajọ omume na-emegbu ndị na-adịghị ike, ndị mpịa mpịa aghụghọ ya mara dịka ọnya.
3Ọ na-anya isi banyere ọchịchọ niile nke obi ya, ọ na-elelị Onyenwe anyị anya ma na-agọzi ndị oke ọchịchọ.
4Nʼọnọdụ mpako ya, onye ajọ omume anaghị achọ Chineke, nʼechiche ya niile, ọ naghị eche banyere ya.
5Ma ihe niile ọ na-eme na-agara ya nke ọma; ọ bụ onye na-ebuli onwe ya elu, iwu gị niile dịkwa anya site nʼebe ọ nọ; ọ na-elelị ndị iro ya niile.
6Nʼime obi ya, ọ na-asị, “Ọ dịghị ihe ga-emetụta m. Aga m anọ nʼọnọdụ ọṅụ mgbe niile. Nsogbu ọbụla agaghị adakwasị m.”