17Ma ịhụnanya Onyenwe anyị na-adịgide site nʼebighị ebi ruo ebighị ebi nʼetiti ndị na-atụ egwu ya. Ezi omume ya na-adịgidekwara ụmụ ụmụ ha,
18nye ndị ahụ niile na-edebe ọgbụgba ndụ ya na ndị na-echeta irubere ụkpụrụ ya isi.
19Onyenwe anyị emeela ka ocheeze ya guzosie ike nʼeluigwe, alaeze ya na-achị ihe niile.
20Toonu Onyenwe anyị, unu ndị mmụọ ozi ya, unu ndị dị ike ndị na-eme ihe ọ chọrọ, na-erubere okwu ya isi.
21Toonu Onyenwe anyị unu usuu ndị agha ya niile; unu ndị na-ejere ya ozi, ndị na-eme uche ya.