7O mere ka Mosis mata ụzọ ya, mekwaa ka ụmụ Izrel mara ọrụ ya dị iche iche:
8Onyenwe anyị nwere obi ọmịiko na-emekwa amara. Ọ dịghị ewe iwe ọsịịsọ, o jupụtara nʼịhụnanya.
9Iwe ya anaghị adịgide ruo mgbe ebighị ebi, ọ bụghị oge niile ka ọ na-anọgide na-ata mmadụ ụta;
10ọ bụghị dịka mmehie anyị si dị ka ọ na-emeso anyị, ọ dịghị akwụghachi anyị dịka ajọ omume anyị si dị.
11Nʼihi na dịka eluigwe si dị elu karịa ụwa, otu a ka ịhụnanya ya si dị ukwuu nʼebe ndị na-atụ egwu ya nọ.