8Ọ na-echeta ọgbụgba ndụ ya ruo mgbe ebighị ebi, bụ nkwa o kwere nye puku ọgbọ,
9ọgbụgba ndụ ahụ nke ya na Ebraham gbara na iyi ọ ṅụrụ nye Aịzik.
10O mere ka o guzoro nye Jekọb dịka ụkpụrụ, ma nʼebe Izrel nọ, dịka ọgbụgba ndụ ebighị ebi:
11“Aga m enye gị ala Kenan dịka oke i ga-eketa.”
12Mgbe ha dị ole na ole nʼọnụọgụgụ, nʼezie ha dị ole na ole, bụrụkwa ọbịa nʼime ya.