12Mgbe ha dị ole na ole nʼọnụọgụgụ, nʼezie ha dị ole na ole, bụrụkwa ọbịa nʼime ya.
13Ha wagharịrị site nʼotu mba gaa na mba ọzọ, sitekwa nʼotu alaeze gaa alaeze ọzọ.
14O kweghị ka onye ọbụla mekpaa ha ahụ; ọ baara ndị eze mba nʼihi ha;
15sị, “Unu emetụkwala ndị m e tere mmanụ aka; unu emekpakwala ndị amụma m ahụ.”
16O zitere ụnwụ nʼala ahụ, bibie ụzọ niile ha si enweta ihe oriri;