Abụ Ọma 105

Ṅụrianụ nʼime aha nsọ ya; ka obi ndị niile na-achọ Onyenwe anyị ṅụrịa.

Psalm 105:3 (UKJV) Glory all of you in his holy name: let the heart of them rejoice that seek the LORD.

1Nyenụ Onyenwe anyị otuto, kwupụtakwa aha ya. Meenụ ka amata nʼetiti mba niile banyere ihe niile ọ rụrụ.

2Bụkuo ya abụ, bụkuo ya abụ otuto; kwupụtanụ ọrụ ihe ịrịbama ya niile.

3Ṅụrianụ nʼime aha nsọ ya; ka obi ndị niile na-achọ Onyenwe anyị ṅụrịa.

4Na-achọnụ Onyenwe anyị na ike ya, chọọnụ ihu ya mgbe niile.

5Chetanụ ọrụ ebube niile nke ọ rụrụ, ihe ịrịbama ya niile na ikpe ziri ezi niile si nʼọnụ ya pụta,

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.