32Nʼọnọdụ mmiri ozuzo, o zitere ha mkpụrụ mmiri na amụma egbe eluigwe nʼala ha niile;
33o tijisịrị osisi vaịnị na osisi fiig niile ha, kwatusịakwa osisi niile dị nʼala ha.
34O kwuru okwu, igurube na ụkpana a na-apụghị ịgụta ọnụ jupụtara ebe niile;
35ha richapụrụ ihe niile bụ ahịhịa ndụ dị nʼala ahụ, ripịakwa mkpụrụ niile ha kụrụ nʼubi ha.
36Mgbe ahụ, o gburu ndị niile e buru ụzọ mụọ nʼala ahụ, mkpụrụ mbụ nke ndị ikom ha.