1Toonu Onyenwe anyị. Keleenụ Onyenwe anyị nʼihi na ọ dị mma; Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
2Onye pụrụ ikwupụtasịcha ihe ukwu niile nke Onyenwe anyị na-arụ maọbụ kwupụta otuto ya niile?
3Ndị a gọziri agọzi ka ha bụ, bụ ndị na-edebe ikpe ziri ezi, ndị ahụ na-eme ezi ihe mgbe niile.
4O Onyenwe anyị, cheta m mgbe ị ga-egosi ndị gị ihuọma, bịa leta m, mgbe ị na-azọpụta ha,