24Emesịa, ha ledara ala ọma ahụ anya, ha ekwenyeghị na nkwa ya.
25Ha tamuru ntamu nʼime ụlọ ikwu ha; ha erubekwaghị isi nye Onyenwe anyị.
26Nʼihi nke a, o weliri aka ya elu ṅụọrọ ha iyi na ọ ga-eme ka ha niile nwụọ nʼọzara,
27mee ka agbụrụ ha daa nʼetiti mba dị iche iche, ma chụsasịa ha nʼala niile.
28Ha dịnyeere ndị na-efe arụsị Baal nke Peoa, riekwa ihe e ji chụọrọ chi na-enweghị ndụ aja;