3Ndị a gọziri agọzi ka ha bụ, bụ ndị na-edebe ikpe ziri ezi, ndị ahụ na-eme ezi ihe mgbe niile.
4O Onyenwe anyị, cheta m mgbe ị ga-egosi ndị gị ihuọma, bịa leta m, mgbe ị na-azọpụta ha,
5ka m soro keta oke na ngọzị ndị gị ị họpụtara, ka m keta oke nʼọṅụ ahụ dịrị mba gị sorokwa ihe nketa gị nye otuto.
6Anyị emehiela, dịka nna nna anyị ha mehiere; anyị emeela ihe ọjọọ, rụọkwa ọrụ ajọ omume.
7Mgbe nna nna anyị ha nọ nʼIjipt, ha echeghị uche banyere ọrụ ebube gị niile; ha echetakwaghị ịba ụba nke ebere gị niile, kama ha nupuru isi nʼakụkụ oke osimiri ahụ, bụ Osimiri Uhie.