12Nʼihi ya, Chineke mere ka ha hụjuo anya site nʼịdọgbu onwe ha nʼọrụ, ha sụrụ ngọngọ daa, ma ọ dịghị onye ọbụla nyeere ha aka ibilite ọtọ.
13Mgbe ahụ, ha kpọkuru Onyenwe anyị nʼime nsogbu ha, ọ zọpụtara ha site na mkpagbu ha niile.
14O mere ka ha site nʼọchịchịrị na oke ihe mwute nke obi pụta. O tijikwara agbụ ha niile.
15Ka ha kelee Onyenwe anyị nʼihi ịhụnanya ya, nke na-adịghị agwụ agwụ na nʼihi ọrụ ebube ya niile nye ụmụ mmadụ,
16nʼihi na o tijisiela ọnụ ụzọ ama niile e ji bronz kpụọ gbujiekwa mkpọrọ ịkpọchi ụzọ niile e ji igwe kpụọ.