Abụ Ọma 107

nʼihi na o jirila ọtụtụ ezi ihe nyejuo ndị agụụ na-agụ afọ meekwa ka onye akpịrị na-akpọ nkụ ṅụjuo afọ.

Psalm 107:9 (UKJV) For he satisfies the longing soul, and fills the hungry soul with goodness.

7O duuru ha nʼụzọ ziri ezi baa nʼobodo ha ga-ebi.

8Ka ha kelee Onyenwe anyị nʼihi ịhụnanya ya nke na-adịghị agwụ agwụ na nʼihi ọrụ ebube ya niile nye ụmụ mmadụ,

9nʼihi na o jirila ọtụtụ ezi ihe nyejuo ndị agụụ na-agụ afọ meekwa ka onye akpịrị na-akpọ nkụ ṅụjuo afọ.

10Ụfọdụ nọdụrụ ala nʼọchịchịrị na nʼọnọdụ oke ihe mwute nke obi, ndị nọ nʼụlọ mkpọrọ na-ata ahụhụ ndị e ji mkpọrọ igwe kee ha agbụ,

11nʼihi na ha nupuru isi megide okwu niile nke Chineke ma lelikwaa ndụmọdụ niile nke Onye kachasị ihe niile elu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.