1O Chineke, onye m na-eto, anọgidekwala na-agba nkịtị,
2nʼihi na ndị ajọ omume na ndị aghụghọ emegheela ọnụ ha megide m; ha aghaala ụgha megide m.
3Ha na-eji okwu ịkpọ asị gbaa m gburugburu; na-ebuso m agha nʼefu.
4Nʼọnọdụ ịhụnanya m hụrụ ha, ha na-ebo m ebubo ma abụ m nwoke onye ekpere.