27Ka ha mara na ọ bụ aka gị, na ọ bụ gị, o Onyenwe anyị, mere ya.
28Ha nwere ike nọgide na-abụ ọnụ, ma ị ga-agọzi; mgbe ha ga-abịa ọgụ, a ga-eme ha ihe ihere, ma ohu gị ga-aṅụrị ọṅụ.
29A ga-eji ihere yikwasị ndị na-ebo m ebubo dịka uwe werekwa ihere kee ha gburugburu dịka uwe mwụda.
30Aga m eji ọnụ m jaa Onyenwe anyị mma nke ukwuu; nʼetiti ọha mmadụ dị ukwuu, aga m eto ya.
31Nʼihi na ọ na-eguzo nʼaka nri nke onye nọ na mkpa, ịzọpụta ya site nʼaka ndị na-ama ya ikpe ọnwụ.