Abụ Ọma 109

Ka ụbọchị ndụ ya dị ole na ole, ka onye ọzọ nara ya ọkwa ya.

Psalm 109:8 (UKJV) Let his days be few; and let another take his office.

6Họpụta otu onye ajọ omume ka o guzogide ya; ka onye na-ebo ebubo ụgha guzokwa nʼaka nri ya.

7Mgbe a ga-ekpe ya ikpe, ka ọ bụrụ onye ikpe mara, ka ekpere ya maa ya ikpe ọnwụ.

8Ka ụbọchị ndụ ya dị ole na ole, ka onye ọzọ nara ya ọkwa ya.

9Ka ụmụ ya ghọọ ndị na-enweghị nna, ka nwunye ya bụrụ nwanyị na-enweghị di.

10Ka ụmụ ya ghọọ ndị arịrịọ na-enweghị ebe obibi, ndị e si na mkpọmkpọ ebe ha bi chụpụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.