99Enwere m nghọta karịa ndị na-ezi m ihe, nʼihi na ana m atụgharịa uche nʼiwu gị niile.
100Enwere m nghọta karịa ndị okenye nʼihi na ana m erubere ụkpụrụ gị niile isi.
101Ajụrụ m ajụ ije ije nʼụzọ ọjọọ ọbụla ka m nwee ike rubere okwu gị isi
102Ewezugaghị m onwe m nʼiwu gị niile, nʼihi na ọ bụ gị onwe gị ziri m ha.
103Lee ka okwu gị niile si atọ m ụtọ, ha dị ụtọ nʼọnụ m karịa mmanụ aṅụ!