14Ana m aṅụrị ọṅụ nʼịgbaso iwu gị niile dịka mmadụ si aṅụrị ọṅụ nʼime oke ịba ụba.
15Ana m atụgharị uche nʼụkpụrụ gị na-atulekwa uche nʼụzọ gị niile.
16Iwu gị na-amasị m; agaghị m elefu okwu gị anya.
17Meere ohu gị ihe ọma, ka m nwe ike dị ndụ; aga m erubere okwu gị isi.
18Kpughee anya m abụọ ka m hụ oke ihe ebube niile dị iche iche dị nʼime okwu gị.