2Ndị a gọziri agọzi ka ha bụ, bụ ndị na-edebe ụkpụrụ ya ma jirikwa obi ha niile na-achọsi ya ike.
3Ha adịghị eme ihe ọjọọ ọbụla; ha na-ejegharị nʼụzọ ya niile.
4I doola ụkpụrụ ndị a ga-erubekwara isi.
5Ọ ga-adị m mma ma ọ bụrụ na m anọgidesie ike na-erube isi nye iwu gị niile!
6Mgbe ahụ, ihere agaghị eme m mgbe m tulere uche nʼiwu gị niile.