39Wepụ nkọcha nke m na-atụ egwu ya, nʼihi na iwu gị niile ziri ezi.
40Ụkpụrụ gị na-agụsị m agụụ ike! Chebe ndụ m site nʼezi omume gị.
41O Onyenwe anyị, ka ịhụnanya gị nke na-adịgide bịakwasị m, nzọpụta gị dịka nkwa i kwere si dị;
42mgbe ahụ, aga m azaghachi onye ahụ na-achị m ọchị, nʼihi na ana m atụkwasị obi m nʼokwu gị.
43Esitela nʼọnụ m napụ okwu nke eziokwu, nʼihi na olileanya m dị nʼiwu gị niile.