63Abụ m enyi ndị niile na-atụ egwu gị, ndị niile na-agbaso ụkpụrụ gị.
64O Onyenwe anyị, ụwa niile jupụtara nʼịhụnanya gị; kuziere m iwu gị niile.
65Meere ohu gị ihe ọma dịka okwu gị si dị, o Onyenwe anyị.
66Zi m ihe ọmụma na ikpe ziri ezi nʼihi na ekwenyere m nʼiwu gị niile.
67Tupu m nwee nsogbu, a kpafuru m, ma ugbu a, ana m erubere okwu gị isi.