68I dị mma, ihe i na-eme ziri ezi; kuziere m iwu gị niile.
69Nʼagbanyeghị na ndị mpako a gbasaala okwu ụgha techie m, ana m eji obi m niile na-edebe ụkpụrụ gị.
70Obi ha siri ike, ọ dịghị ihe na-emetụta ha, ma ana m enwe mmasị nʼiwu gị.
71Ọ dị mma na m tara ahụhụ ka m nwee ike mụta iwu gị niile.
72Iwu si nʼọnụ gị pụta dị oke ọnụahịa nye m karịa imerime puku ọlaọcha na ọlaedo.