74Ka ndị na-atụ egwu gị ṅụrịa mgbe ha hụrụ m, nʼihi na olileanya m dị nʼokwu gị.
75O Onyenwe anyị, amaara m na iwu gị niile ziri ezi, ọ bụkwa nʼikwesị ntụkwasị obi ka ị tara m ahụhụ.
76Ka ịhụnanya gị nke na-adịghị agwụ agwụ kasịe m obi, dịka nkwa i kwere ohu gị si dị.
77Ka ọmịiko gị bịakwasị m, ka m nwee ike dị ndụ, nʼihi na iwu gị na-amasị m.
78Ka ihere mee ndị mpako nʼihi ihe ọjọọ ha mere m na-enweghị ihe m mere; ma aga m atụgharị uche nʼụkpụrụ gị.