80Ka m were obi zuruoke na-agbaso ụkpụrụ gị niile, ka ihere ghara ime m.
81Mkpụrụobi m na-ada mba site nʼọchịchọ ya maka nzọpụta gị, ma olileanya m dị nʼokwu gị.
82Anya na-egbu m mgbu ebe m na-ele anya nkwa gị; ana m asị, “Olee mgbe ị ga-akasị m obi?”
83Nʼagbanyeghị na adị m ka karama akpụkpọ nke dị nʼanwụrụ ọkụ, anaghị m echefu iwu gị niile.
84Ruo olee mgbe ka ohu gị ga-anọgide na-eche? Olee mgbe ka ị ga-ata ndị na-akpagbu m ahụhụ?