84Ruo olee mgbe ka ohu gị ga-anọgide na-eche? Olee mgbe ka ị ga-ata ndị na-akpagbu m ahụhụ?
85Ndị mpako na-egwuru m olulu, bụ ihe nke na-adịghị ka iwu gị si dị.
86Iwu gị niile kwesiri ntụkwasị obi; nyere m aka, nʼihi na ndị mmadụ na-akpagbu m ma o nweghị ihe m mere ha.
87Ọ fọdụrụ ntakịrị ihe, ha gaara ala m nʼiyi, ma agbakụtaghị m ụkpụrụ gị azụ.
88Site nʼịhụnanya gị nke na-adịgide chebe ndụ m, ka m nwe ike rube isi nʼiwu nke ọnụ gị.