94Zọpụta m, nʼihi na abụ m nke gị; achọpụtala m ụkpụrụ gị niile.
95Ndị ajọ omume na-eche ịla m nʼiyi, ma aga m atụgharị uche nʼụkpụrụ gị.
96Ana m ahụ nsọtụ ihe niile zuruoke, ma iwu gị niile enweghị nsọtụ.
97O, otu m si hụ iwu gị nʼanya! Ana m atụgharị uche na ya ogologo ụbọchị niile.
98Iwu gị na-eme ka amamihe m karịa nke ndị iro m, ha na-anọnyere m oge niile.