1Aga m ebuli gị elu, Chineke m onye bụ eze; aga m eto aha gị, site nʼebighị ebi ruo ebighị ebi.
2Ụbọchị niile ka m ga-eto gị jaakwa aha gị mma site nʼebighị ebi ruo ebighị ebi.
3Onyenwe anyị dị ukwuu, bụrụkwa onye kwesiri ịnata otuto; ịdị ukwuu ya karịrị ihe onye ọbụla pụrụ ịghọta.
4Otu ọgbọ ga-eto ọrụ gị niile nʼihu ọgbọ ọzọ; ha ga-ekwupụta maka ọrụ ukwuu gị niile dị iche iche.