18Onyenwe anyị na-anọ nso ndị niile na-akpọku ya, bụ ndị niile na-akpọku ya nʼeziokwu.
19Ọ na-emezu ọchịchọ niile nke ndị na-atụ egwu ya; ọ na-anụ akwa ha na-azọpụtakwa ha.
20Onyenwe anyị na-echebe ndị niile hụrụ ya nʼanya, ma ọ ga-ala ndị ajọ omume niile nʼiyi.
21Ọnụ m ga-ekwupụta otuto Onyenwe anyị; ka ihe niile e kere eke too aha nsọ ya ruo mgbe ebighị ebi.