11Onyenwe anyị na-enwe mmasị nʼebe ndị na-atụ egwu ya nọ, ndị olileanya ha dị na ịhụnanya ya nke na-adịghị agharịpụ.
12O Jerusalem, jaa Onyenwe anyị mma; o Zayọn, too Chineke gị.
13Nʼihi na o wusiela mkpọrọ ọnụ ụzọ ama gị niile ike, na-agọzikwa ndị niile bi nʼime gị.
14Ọ na-eme ka oke ala gị nwee udo, jirikwa ọka wiiti kachasị mma nyejuo gị afọ.
15Ọ na-ezipụ iwu ya nʼelu ụwa niile; okwu ya na-agbasa ngwangwa.