Abụ Ọma 147

Ọ na-ezipụ iwu ya nʼelu ụwa niile; okwu ya na-agbasa ngwangwa.

Psalm 147:15 (UKJV) He sends forth his commandment upon earth: his word runs very swiftly.

13Nʼihi na o wusiela mkpọrọ ọnụ ụzọ ama gị niile ike, na-agọzikwa ndị niile bi nʼime gị.

14Ọ na-eme ka oke ala gị nwee udo, jirikwa ọka wiiti kachasị mma nyejuo gị afọ.

15Ọ na-ezipụ iwu ya nʼelu ụwa niile; okwu ya na-agbasa ngwangwa.

16Ọ na-atụsa snoo nʼala dịka ajị anụ, na-efesasị igirigi snoo dịka ntụ.

17Ọ na-atụdata mkpụrụ mmiri ya dị ka mkpụrụ okwute. Onye pụrụ iguzogide oke ifufe oyi ya?

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.