Abụ Ọma 147

Ọ na-agwọ ndị niile obi ha tiwara etiwa na-ekechikọtakwa ebe niile ha merụrụ ahụ.

Psalm 147:3 (UKJV) He heals the broken in heart, and binds up their wounds.

1Toonu Onyenwe anyị! Ọ bụ ihe dị mma ịbụku Chineke anyị abụ otuto. Ọ bụ ihe na-eweta mmasị, bụrụkwa ihe ziri ezi ito ya!

2Onyenwe anyị na-ewu Jerusalem: ọ na-akpọghachita ụmụ Izrel ndị a dọọrọ nʼagha gaa nʼala ọzọ.

3Ọ na-agwọ ndị niile obi ha tiwara etiwa na-ekechikọtakwa ebe niile ha merụrụ ahụ.

4Ọ bụ ya na-ekpebi ọnụọgụgụ kpakpando niile na-akpọkwa ha nʼotu na otu.

5Onyenwe anyị dị ukwuu, ike ya dịkwa ukwuu; nghọta ya enweghị nsọtụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.