Abụ Ọma 148

Toonu ya, ndị mmụọ ozi ya niile, toonu ya, unu usuu ndị agha ya niile.

Psalm 148:2 (UKJV) Praise all of you him, all his angels: praise all of you him, all his hosts.

1Toonu Onyenwe anyị. Toonu Onyenwe anyị site nʼeluigwe, toonu ya nʼebe niile kachasị elu.

2Toonu ya, ndị mmụọ ozi ya niile, toonu ya, unu usuu ndị agha ya niile.

3Toonu ya, anyanwụ na ọnwa toonu ya, kpakpando niile.

4Toonu ya, unu eluigwe kachasị elu na unu mmiri dị nʼelu mbara eluigwe.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.