5Ka ha niile too aha Onyenwe anyị, nʼihi na ha niile malitere ịdị site nʼokwu ọnụ ya.
6O doro ha nʼọnọdụ ha ga-anọ ruo mgbe ebighị ebi; o nyere iwu nke a na-agaghị agabiga.
7Toonu Onyenwe anyị, site nʼụwa, unu oke anụ mmiri niile na ogbu mmiri niile,
8na amụma, na mkpụrụ mmiri, na snoo na igwe ojii niile, na oke ifufe niile na-eme ihe o nyere nʼiwu,
9unu ugwu ukwu niile, na ugwu nta niile na osisi niile na-amị mkpụrụ na osisi sida niile