12Ha ka ọdụm agụụ na-agụ nke zoro onwe ya nʼọhịa, dịka ọdụm dị ike na-eche ihe ọ ga-adọgbu.
13Onyenwe anyị, bilie guzogide ha, tigbuo ha. Jiri mma agha gị zọpụta m site nʼaka ndị ajọ omume.
14O Onyenwe anyị, zọpụta m site nʼaka ndị dị otu a, site nʼaka ndị ụgwọ ọrụ ha bụ nʼụwa a. Ka ihe ịkpakọbara debere ndị ajọ omume jupụta afọ ha, ka afọ jukwa ụmụ site nʼihe ndị a, ka ha hapụrụ ihe fọdụrụ nye ụmụntakịrị ha.
15Ma mụ onwe m ga-ahụ ihu gị site nʼezi omume; mgbe m ga-ebili, afọ ga-eju m nke ọma, nʼihi na aga m ahụ gị ihu na ihu.