Abụ Ọma 17

Ọ bụ ezie na ị nyochaala obi m, i letala m nʼabalị, nwalekwaa m, ị ga-achọpụta na o nweghị ihe ọ ọjọọ bụla m zubere, na ọnụ m ekwuhiebeghị.

Psalm 17:3 (UKJV) You have proved mine heart; you have visited me in the night; you have tried me, and shall find nothing; I am purposed that my mouth shall not transgress.

1O Onyenwe anyị, nụrụ arịrịọ m ziri ezi, nụrụkwa mkpu akwa m. Gee ntị nʼekpere m nʼihi na o siteghị nʼegbugbere ọnụ na-ekwu okwu aghụghọ.

2Ka mkpepụta m si nʼaka gị bịa; ka anya gị hụ ihe ziri ezi.

3Ọ bụ ezie na ị nyochaala obi m, i letala m nʼabalị, nwalekwaa m, ị ga-achọpụta na o nweghị ihe ọ ọjọọ bụla m zubere, na ọnụ m ekwuhiebeghị.

4Ndị mmadụ agbalịala inye m ngarị ma anaghị m ekwe ka mụ na ndị na-eme ihe ike nwee mmekọrịta nʼihi iwu sitere nʼegbugbere ọnụ gị.

5Nzọ ụkwụ m akpafubeghị site nʼụzọ gị, ụkwụ m agbụchapụghịkwa site nʼọnọdụ ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.